1 Chronicles 16

Abụ ekele

1Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ guzobe ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Ha chekwara aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Chineke. 2Mgbe Devid chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị. 3O nyekwara onye ọbụla nʼIzrel, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ.

4Ọ họpụtara ụfọdụ ndị Livayị ka ha nọdụ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ inye Onyenwe anyị, Chineke Izrel ekele na otuto na ịrịọ ya ngọzị nʼisi ndị ya Izrel. Ndị a bụ ndị o nyere ije ozi a: 5Asaf bụ onyeisi ndị a. Ndị ọzọ bụ Zekaraya, Jeiel, Shemiramot, Jehiel, Matitaia, Eliab, Benaya, Obed-Edọm na Jeiel. Ọrụ ha bụ ịkpọ ụbọ akwara, na une, ma ọrụ Asaf bụ onye na-akụ ogene ọla na-ada ụda. 6Benaya na Jahaziel, ndị nchụaja, ketara ọrụ ịfụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke kwamgbe kwamgbe.

7Nʼụbọchị ahụ ka Devid buru ụzọ họpụta Asaf na ndị otu ya ka ha nye Onyenwe anyị otuto nʼusoro dị otu a:

8Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya,
meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
9Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto;
kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile.
10Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;
ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ.
11Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.

12Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,
ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile nke si nʼọnụ ya pụta.
13Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya
ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
14Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
ikpe ya dị nʼụwa niile.

15Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi;
bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ.
16Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara,
na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
17O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
ma nʼebe Izrel nọ dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
18Sị, “Aga m enye gị ala Kenan
ka ọ bụrụ ihe nketa gị.”

19Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
nʼezie, ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼala ahụ.
20Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ,
sitekwa nʼotu alaeze gaa na alaeze ọzọ.
21O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
ọ baara ndị eze mba nʼihi ha, sị:
22“Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka,
unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”

23Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile;
kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
24Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,
kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.

25Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto.
Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
26Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,
maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
27Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;
ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.

28Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
29E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya,
werenụ onyinye bịa nʼihu ya.
Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya.
30Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya.

31Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;
ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”
32Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya,
ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ,
ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị,
nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.

34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
35Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị;
chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche,
ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele;
ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.”
36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”

37Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị. 38Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.

39Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn. 40Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel. 41Devid họpụtakwara Heman, na Jedutun, na ndị ọzọ a kpọrọ aha họpụta inye Onyenwe anyị ekele, “nʼihi ịhụnanya ya na obi ebere ya nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi.” 42Heman na Jedutun bụ ndị ọ dịịrị ịfụ opi, na ịkụ ogene ọla, na ihe egwu ndị ọzọ eji na-enye Chineke otuto. Ụmụ ndị ikom Jedutun bụ ndị nọ nche nʼọnụ ụzọ ama.

43Mgbe mmemme ahụ gwụsịrị, onye ọbụla lara nʼụlọ ya. Devid lakwara ịgọzi ezinaụlọ ya.

Copyright information for IboBIU